Ekiliziastis 9:4
Ecclesiastes 9:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ.
Ecclesiastes 9:4 in English
Ecclesiastes 9:4 · Berean Standard Bible
There is hope, however, for anyone who is among the living; for even a live dog is better than a dead lion.
Context
2Ihe niile na-adakwasị mmadụ niile nʼotu ụzọ ahụ, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume, ezi mmadụ na onye na-abụghị ezi mmadụ, onye dị ọcha na onye na-adịghị ọcha, onye na-achụ aja na onye na-adịghị achụ aja.
Dịka ọ dịrị ezi mmadụ,
otu a ka ọ dịrị onye mmehie;
dịka ọ dịrị ndị na-aṅụ iyi,
otu a kwa ka ọ dị nye ndị na-adịghị aṅụ. 3Nke a bụkwa ihe ọjọọ na-eme nʼokpuru anyanwụ. Otu ihe ndakwasị dịrị mmadụ niile. Ọzọkwa, obi ụmụ mmadụ jupụtara nʼihe ọjọọ na ịyị ara mgbe ha nọ na ndụ, emesịa ha alakwuru ndị nwụrụ anwụ. 4Naanị ndị dị ndụ nwere olileanya. Ọ ka mma ịbụ nkịta dị ndụ karịa ịbụ ọdụm nwụrụ anwụ. 5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,
ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;
ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,
nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu. 6Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,
na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.
Ha agaghị enwekwa oke
nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.