Ekiliziastis 9:7
Ecclesiastes 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị.
Ecclesiastes 9:7 in English
Ecclesiastes 9:7 · Berean Standard Bible
Go, eat your bread with joy, and drink your wine with a cheerful heart, for God has already approved your works:
Context
5Nʼihi na ndị dị ndụ maara nke ọma na ha ga-anwụ,
ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọbụla;
ha enwekwaghị ụgwọ ọrụ ọzọ,
nʼihi na ha bụ ndị echefurula echefu. 6Ịhụnanya ha, na ịkpọ asị ha,
na ekworo ha gabigara mgbe ha nwụrụ.
Ha agaghị enwekwa oke
nʼihe ọbụla na-eme nʼokpuru anyanwụ. 7Ya mere, gaa nʼihu, jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa ọṅụ ṅụọ ihe ọṅụṅụ nʼihi na ọ bụ ugbu a ka Chineke nabatara ọrụ gị. 8Yiri akwa dị ọcha mgbe niile, tee mmanụ na-esi isi ụtọ nʼisi gị.* 9Bie ndụ obi ụtọ, gị na nwunye gị ị hụrụ nʼanya, ụbọchị niile nke ndụ ihe efu gị nke Chineke nyere gị nʼokpuru anyanwụ, nʼihi na nke a bụ oke dịịrị gị na ndụ ndọgbu onwe gị nʼọrụ nʼokpuru anyanwụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.