Ekiliziastis 9:16
Ecclesiastes 9:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe.
Ecclesiastes 9:16 in English
Ecclesiastes 9:16 · Berean Standard Bible
And I said, “Wisdom is better than strength, but the wisdom of the poor man is despised, and his words are not heeded.”
Context
14Ọ dị obodo nke naanị mmadụ ole na ole bi nʼime ya, ma otu eze dị ike chịịrị ndị agha ya bịa ibuso obodo nta a agha. Ndị agha ya gbara obodo a gburugburu na-achọ ịkwatu mgbidi ya. 15Ma ọ dị otu onye ogbenye bi nʼobodo nta ahụ, onye maara ihe, ọ zọpụtara obodo ahụ site nʼamamihe ya. Ma o nweghị onye chetara ihe banyere ya. 16Nke a mere m ji sị, inwe amamihe bara uru karịa ịdị ike, ma ọ bụrụ na onye amamihe ahụ bụ onye ogbenye, a ga-eleda ya anya, a gaghị akpọkwa okwu ya ihe. 17Okwu nke onye maara ihe na-ekwu na nwayọọ ka a na-anụ,
karịa iti mkpu nke onye na-achị achị nʼetiti ndị nzuzu. 18Amamihe ka ihe agha niile mma,
ma otu onye mmehie na-ala ọtụtụ ezi ihe nʼiyi.
9:8 Ihe e ji maara ndị Juu nʼoge mmemme, maọbụ ụbọchị izuike, bụ iyi akwa ọcha na itekwasị mmanụ nʼisi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.