Ekiliziastis 6:9
Ecclesiastes 6:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe eji anya hụ ka mma karịa oke ọchịchọ! Nke a bụkwa ihe efu na ịchụso ifufe.
Ecclesiastes 6:9 in English
Ecclesiastes 6:9 · Berean Standard Bible
Better what the eye can see than the wandering of desire. This too is futile and a pursuit of the wind.
Context
7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,*
ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya. 8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?
Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye
na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?* 9Ihe eji anya hụ
ka mma karịa oke ọchịchọ!
Nke a bụkwa ihe efu
na ịchụso ifufe. 10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.
Amakwaara ihe mmadụ bụ,
mmadụ ọbụla apụghị ịlụso
onye ka ya ike ọgụ. 11Okwu na-aba ụba,
nghọta na-adị nta.
O nwere uru nke a bara?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.