Ekiliziastis 6:7
Ecclesiastes 6:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,* ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya.
Ecclesiastes 6:7 in English
Ecclesiastes 6:7 · Berean Standard Bible
All a man’s labor is for his mouth, yet his appetite is never satisfied.*
Context
5Ọ bụ ezie na ọ gaghị ahụ ihe anwụ anya, ọ makwaghị ihe ọbụla, o nwere izuike karịa nwoke ahụ. 6A sịkwarị na o biri ndụ puku afọ, okpukpu abụọ, ma ọ nụghị ụtọ akụnụba ya. Ọ bụghị nʼotu ebe ka ha niile na-ala? 7Ndọgbu niile mmadụ na-adọgbu onwe ya nʼọrụ bụ ka o rijuo afọ,*
ma o nweghị onye na-enweta ihe na-ezuru ya. 8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?
Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye
na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?* 9Ihe eji anya hụ
ka mma karịa oke ọchịchọ!
Nke a bụkwa ihe efu
na ịchụso ifufe.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.