Ekiliziastis 6:10
Ecclesiastes 6:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga. Amakwaara ihe mmadụ bụ, mmadụ ọbụla apụghị ịlụso onye ka ya ike ọgụ.
Ecclesiastes 6:10 in English
Ecclesiastes 6:10 · Berean Standard Bible
Whatever exists was named long ago, and what happens to a man is foreknown; but he cannot contend with one stronger than he.
Context
8Olee ụzọ onye maara ihe si dị mma karịa onye nzuzu?
Gịnị bụ uru dịịrị onye ogbenye
na ọ maara otu e si akpa ezi agwa nʼihu ndị dị ndụ?* 9Ihe eji anya hụ
ka mma karịa oke ọchịchọ!
Nke a bụkwa ihe efu
na ịchụso ifufe. 10Ihe ọbụla dị ugbu a, ka akpọrọ aha na mgbe gara aga.
Amakwaara ihe mmadụ bụ,
mmadụ ọbụla apụghị ịlụso
onye ka ya ike ọgụ. 11Okwu na-aba ụba,
nghọta na-adị nta.
O nwere uru nke a bara? 12Onye mara ihe dịrị mmadụ mma na ndụ, nʼụbọchị ole na ole nke na-abaghị uru o nwere ịgabiga ndụ a dịka onyinyo? Onye pụrụ ịgwa ya ihe ga-eme nʼokpuru anyanwụ, mgbe ọ nwụsịrị?
6:3 Maọbụ, a mụkworo amụkwo
6:7 Ilu 16:26
6:8 Maọbụ, nʼebe ndị ọzọ nọ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.