Ekiliziastis 5:3
Ecclesiastes 5:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ.
Ecclesiastes 5:3 in English
Ecclesiastes 5:3 · Berean Standard Bible
As a dream comes through many cares, so the speech of a fool comes with many words.
Context
1Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ. 2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu
maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,
maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.*
Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe
ma naanị nʼụwa ka ị nọ,
nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. 3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. 4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. 5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.