Native Bible

Ecclesiastes 5:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.

Ecclesiastes 5:4 in English

Ecclesiastes 5:4 · Berean Standard Bible

When you make a vow to God, do not delay in fulfilling it, because He takes no pleasure in fools. Fulfill your vow.

Context

2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.* Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. 3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ, otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. 4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke. 5Ọ ka mma na ị gbara nkịtị karịa na ị ga-ekwe nkwa ma ị gaghị emezu ya. 6Ekwela ka ọnụ gị duba gị na mmehie. Azọkwala onwe gị site nʼịgwa onyeozi Chineke, “na i kwere nkwa a na-amaghị ama.” Nʼihi gịnị ka Chineke ga-eji wee iwe nʼihi ihe ị kwuru, ma bibiekwa ọrụ aka gị?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.