Ekiliziastis 5:2
Ecclesiastes 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị, maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.* Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe ma naanị nʼụwa ka ị nọ, nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole.
Ecclesiastes 5:2 in English
Ecclesiastes 5:2 · Berean Standard Bible
Do not be quick to speak, and do not be hasty in your heart to utter a word before God. After all, God is in heaven and you are on earth. So let your words be few.
Context
1Mgbe ị na-aba nʼụlọ ukwu Chineke, lezie anya. Meghee ntị gị nke ọma, karịa ịchụ aja onyinye nke ndị nzuzu, ndị na-amaghị na ha na-eme ihe ọjọọ. 2Abụla onye na-eme ọsịịsọ ikwu okwu
maọbụ ime ngwangwa nʼime echiche obi gị,
maọbụ ikwe Chineke nkwa ọnụ efu.*
Nʼihi na Chineke nọ nʼeluigwe
ma naanị nʼụwa ka ị nọ,
nʼihi ya ka okwu ọnụ gị dị ole na ole. 3Dị ka ọtụtụ nchekasị si eweta ị rọọ nrọ,
otu a ka okwu onye nzuzu si dị mgbe ọtụtụ okwu dị ya nʼọnụ. 4Nʼihi ya, mgbe ị na-ekwe Chineke nkwa, atụfula oge imezu ihe ahụ, nʼihi na ihe banyere ndị nzuzu adịghị atọ Chineke ụtọ. Mezuo nkwa niile i kwere Chineke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.