Ekiliziastis 2:4
Ecclesiastes 2:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị.
Ecclesiastes 2:4 in English
Ecclesiastes 2:4 · Berean Standard Bible
I expanded my pursuits. I built houses and planted vineyards for myself.
Context
2“Ọchị,” ka m sịrị na “ọ bụ ihe nzuzu. Ikpori ndụ, uru gịnị ka ọ bara?” 3Echere m nʼobi ụtọ m ga-esite nʼịṅụ mmanya. Agbasokwara m ụzọ ibi ndụ nzuzu ma obi m nọ nnọọ na-edu m site nʼamamihe. Olileanya m bụ na m ga-esi otu a chọta ụzọ kachasị mma ndị mmadụ nwere ike iji bie mkpụmkpụ ndụ ha nʼụwa. 4Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị. 5Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha, 6wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.