Native Bible

Ecclesiastes 2:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri.

Ecclesiastes 2:6 in English

Ecclesiastes 2:6 · Berean Standard Bible

I built reservoirs to water my groves of flourishing trees.

Context

4Arụpụtara m ọtụtụ ihe dị iche iche, ewuru m ụlọ nye onwe m ma nweekwa ubi vaịnị. 5Ewuru m ubi a gbara ogige ebe izuike, ma kụọkwa osisi na-amị mkpụrụ dị iche iche nʼime ha, 6wuore onwe m ọdọ mmiri ebe a ga-esi na-agba ubi m niile mmiri. 7Agbatara m ndị ohu nwoke na nwanyị, nweekwa ndị ohu ọzọ a mụrụ nʼụlọ m. Enwekwara m ọtụtụ igwe ehi na anụ ụlọ karịa eze niile ndị bu m ụzọ chịa na Jerusalem. 8Achịkọtara m ọlaọcha na ọlaedo nye onwe m, na akụnụba nke ọtụtụ ndị eze na-achị ala ha na-atụtara m. E nwetakwara m nye onwe m ndị ikom na ndị inyom ndị na-abụ abụ. Enwekwara ndị iko nwanyị nʼebe ọ bara ụba. Ihe ụtọ niile ndị na-amasị obi nwa mmadụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.