Native Bible

Deuteronomy 9:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie.

Deuteronomy 9:13 in English

Deuteronomy 9:13 · Berean Standard Bible

The LORD also said to me, “I have seen this people, and they are indeed a stiff-necked people.

Context

11Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ. 12Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.” 13Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie. 14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.” 15Ya mere, atụgharịrị m malite isi nʼugwu ahụ na-enwu ọkụ rịdata, ejikwa m mbadamba nkume abụọ nke ọgbụgba ndụ ahụ nʼaka m.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.