Diuteronomi 9:12
Deuteronomy 9:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.”
Deuteronomy 9:12 in English
Deuteronomy 9:12 · Berean Standard Bible
And the LORD said to me, “Get up and go down from here at once, for your people, whom you brought out of Egypt, have corrupted themselves. How quickly they have turned aside from the way that I commanded them! They have made for themselves a molten image.”
Context
10Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ. 11Mgbe iri abalị anọ gwụrụ Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ. 12Mgbe ahụ ka Onyenwe anyị gwara m sị m, “Rịdata ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i si nʼIjipt dupụta, emerụọla onwe ha, ha emeela ngwangwa iwezuga onwe ha site nʼiwu m nyere ha. Ha emeerela onwe ha nwa ehi a kpụrụ akpụ, ka ọ bụrụ chi ha.” 13Onyenwe anyị gwara m sị, “Ahụla m na ndị a bụ ndị isiike nʼezie. 14Hapụ m, ka m kpochapụ ma hichapụkwa aha ha site nʼokpuru eluigwe. Aga m emekwa gị ka ị ghọọ mba dị ike karịa, dịkwa ọtụtụ nʼọnụọgụgụ karịa ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.