Native Bible

Deuteronomy 8:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.

Deuteronomy 8:4 in English

Deuteronomy 8:4 · Berean Standard Bible

Your clothing did not wear out and your feet did not swell during these forty years.

Context

2Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya. 3E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 4Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza. 5Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị. 6Debe iwu Onyenwe anyị Chineke gị. Na-ejegharị ije nʼụzọ ya, ma na-atụkwa ya egwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.