Diuteronomi 8:3
Deuteronomy 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
Deuteronomy 8:3 in English
Deuteronomy 8:3 · Berean Standard Bible
He humbled you, and in your hunger He gave you manna to eat, which neither you nor your fathers had known, so that you might understand that man does not live on bread alone, but on every word that comes from the mouth of the LORD.*
Context
1Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa. 2Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya. 3E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 4Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza. 5Nʼihi ya, mata nke a nʼobi gị, na dịka nna si adọ nwa ya aka na ntị, otu a ka Onyenwe anyị bụ Chineke gị si adọ gị aka na ntị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.