Native Bible

Deuteronomy 8:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya.

Deuteronomy 8:2 in English

Deuteronomy 8:2 · Berean Standard Bible

Remember that these forty years the LORD your God led you all the way in the wilderness, so that He might humble you and test you in order to know what was in your heart, whether or not you would keep His commandments.

Context

1Lezie anya hụ na i debezuru iwu ndị a niile m nyere gị taa. Ọ bụrụ na i debe ha, ọ bụghị naanị na ị ga-adị ndụ, kama ị ga-amụba, banyekwa inweta ala ahụ Onyenwe anyị kwere nna nna gị ha na nkwa. 2Chetakwa otu Onyenwe anyị bụ Chineke gị si duo gị nʼime ọzara iri afọ anọ ndị a niile. O wedara mmụọ gị ala, nwakwaa gị ọnwụnwa ịmata ihe dị gị nʼobi, ịchọpụta ma ị ga-edebekwa iwu ya. 3E, o wedatara mmụọ gị ala mgbe o mere ka ihe oriri kọ gị, mgbe o mere ka i rie mánà, nri ahụ gị na nna gị na-amaghị ihe ọ bụ. O mere nke a igosi gị na izi gị na ọ bụghị naanị achịcha ka mmadụ ga-eji dị ndụ, kama ọ bụ nʼokwu niile nke si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta. 4Iri afọ anọ ndị a niile, uwe gị akaghị nka, ụkwụ gị azakwaghị aza.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.