Diuteronomi 7:10
Deuteronomy 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.
Deuteronomy 7:10 in English
Deuteronomy 7:10 · Berean Standard Bible
But those who hate Him He repays to their faces with destruction; He will not hesitate to repay to his face the one who hates Him.
Context
8Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt. 9Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu. 10Ma
onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya,
ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha. 11Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa. 12Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.