Native Bible

Deuteronomy 7:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha.

Deuteronomy 7:12 in English

Deuteronomy 7:12 · Berean Standard Bible

If you listen to these ordinances and keep them carefully, then the LORD your God will keep His covenant and the loving devotion that He swore to your fathers.

Context

10Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha. 11Nʼihi ya, hụ na unu debezuru iwu na ụkpụrụ ndị a m na-enye unu taa. 12Ọ bụrụ na unu elezie anya, ṅaa ntị nʼiwu ndị a, debe ha, ma mezuokwa ha, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-emezuru unu ọgbụgba ndụ ịhụnanya ahụ dịka ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha. 13Ọ ga-ahụ unu nʼanya, gọzie unu, meekwa ka unu baa ụba nʼọnụọgụgụ. Ọ ga-agọzi unu nʼọmụmụ, gọzie ihe ọkụkụ nke ala unu, ọka unu, na mmanya ọhụrụ unu, na mmanụ unu, na ụmụ ehi unu mụrụ, na ụmụ igwe atụrụ unu mụrụ, nʼala ahụ ọ ṅụụrụ nna nna unu ha iyi inye unu. 14A ga-agọzi unu karịa mba ndị ọzọ niile dị nʼụwa. Ọ dịghị onye ọbụla nʼime unu, maọbụ nwoke maọbụ nwanyị ga-anọ na-amụtaghị nwa, ọ dịkwaghị anụ ụlọ unu ga-agba aka nwa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.