Native Bible

Deuteronomy 7:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt.

Deuteronomy 7:8 in English

Deuteronomy 7:8 · Berean Standard Bible

But because the LORD loved you and kept the oath He swore to your fathers, He brought you out with a mighty hand and redeemed you from the house of slavery, from the hand of Pharaoh king of Egypt.

Context

6Nʼihi na unu bụ ndị dị nsọ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Onyenwe anyị bụ Chineke unu ahọpụtala unu site nʼagbụrụ niile dị nʼụwa a, ka unu bụrụ ndị nke ya, ihe onwunwe ya dị oke ọnụahịa. 7Ọ bụghị nʼihi na unu dị ukwuu nʼọnụọgụgụ karịa ndị mba ọzọ, ka Onyenwe anyị ji họpụta unu, hụ unu nʼanya otu a, nʼezie unu dịkarịsịrị nta nʼọnụọgụgụ. 8Kama, ọ bụ nʼihi Onyenwe anyị hụrụ unu nʼanya, mezuokwa iyi ọ ṅụrụ nye nna nna unu ha, ka o ji site nʼaka ya dị ike gbapụta unu site nʼala ebe unu bụ ndị ohu, site nʼike nke Fero, bụ eze Ijipt. 9Matanụ nke ọma na Onyenwe anyị bụ Chineke unu bụ Chineke. Ọ bụ Chineke kwesiri ntụkwasị obi, onye na-edebe ọgbụgba ndụ ịhụnanya ya ruo puku ọgbọ, nye ndị niile hụrụ ya nʼanya, ndị na-edebe ihe niile o nyere nʼiwu. 10Ma onye kpọrọ ya asị, ọ na-eji mbibi kwụghachi ya ụgwọ nʼihu ya, ọ gaghị egbu oge ịkwụghachi onye kpọrọ ya asị ụgwọ nʼihu ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.