Diuteronomi 6:5
Deuteronomy 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya.
Deuteronomy 6:5 in English
Deuteronomy 6:5 · Berean Standard Bible
And you shall love the LORD your God with all your heart and with all your soul and with all your strength.*
Context
3Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa. 4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi. 7Ị ga-akụziri ya ụmụ gị. Kwuo okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ ala nʼụlọ gị, mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.