Diuteronomi 6:4
Deuteronomy 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu.
Deuteronomy 6:4 in English
Deuteronomy 6:4 · Berean Standard Bible
Hear, O Israel: The LORD our God, the LORD is One.*
Context
2Ihe e ji nye iwu ndị a bụ ka unu na ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, tụọ egwu Onyenwe anyị bụ Chineke unu, site nʼidebe iwu ya, ogologo ndụ unu niile. Ọ bụrụ na unu emee ya, unu ga-enwe ndụ ogologo. 3Nụrụ Izrel ma lezie anya nʼirube isi, ka ihe gaara unu nke ọma, ka unu baa ụba nke ukwuu nʼala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru nʼime ya, ọ bụladị dịka Onyenwe anyị Chineke nna nna unu ha kwere unu na nkwa. 4Nụrụ gị Izrel, Onyenwe anyị bụ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu. 5Were obi gị niile, na mkpụrụobi gị niile, na uche gị na ike gị niile, hụ Onyenwe anyị Chineke gị nʼanya. 6Iwu ndị a m na-enye gị taa ka ị ga-eme ka ọ dịrị gị nʼobi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.