Native Bible

Deuteronomy 32:47 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”

Deuteronomy 32:47 in English

Deuteronomy 32:47 · Berean Standard Bible

For they are not idle words to you, because they are your life, and by them you will live long in the land that you are crossing the Jordan to possess.”

Context

45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel, 46ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. 47Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.” 48Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, 49“Bilie ga nʼugwu Nebo nke dị nʼetiti ugwu Abarim, nʼala Moab, na ncherita ihu Jeriko, leekwa ala Kenan anya, bụ ala ahụ m na-enye ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.