Diuteronomi 32:45
Deuteronomy 32:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,
Deuteronomy 32:45 in English
Deuteronomy 32:45 · Berean Standard Bible
When Moses had finished reciting all these words to all Israel,
Context
43Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,
nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,
ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya,
kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha. 44Mosis na Joshua* nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel. 45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel, 46ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. 47Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.