Diuteronomi 32:43
Deuteronomy 32:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya, nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya, ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya, kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha.
Deuteronomy 32:43 in English
Deuteronomy 32:43 · Berean Standard Bible
Rejoice, O heavens, with Him, and let all God’s angels worship Him. * Rejoice, O nations, with His people;* for He will avenge the blood of His children.* He will take vengeance on His adversaries and repay those who hate Him;* He will cleanse His land and His people.
Context
41mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma,
mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe,
aga m abọ ọbọ megide ndị iro,
kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị. 42Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ,
ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ,
ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha,
na isi ndị ndu ndị iro.” 43Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,
nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,
ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya,
kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha. 44Mosis na Joshua* nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel. 45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.