Diuteronomi 32:42
Deuteronomy 32:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ, ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ, ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha, na isi ndị ndu ndị iro.”
Deuteronomy 32:42 in English
Deuteronomy 32:42 · Berean Standard Bible
I will make My arrows drunk with blood, while My sword devours flesh— the blood of the slain and captives, the heads of the enemy leaders.”
Context
40Ana m eweli aka nʼeluigwe na-ekwupụta nʼịnụ iyi sị,
dịka m na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, 41mgbe m mụrụ mma agha m na-egbu amụma,
mgbe aka m jidere mma agha ahụ nʼọnọdụ ikpe ikpe,
aga m abọ ọbọ megide ndị iro,
kwụghachi ndị ahụ niile kpọrọ m asị. 42Aga m eme ka àkụ m ṅụjuo ọbara afọ,
ma mma agha ga-ebibi anụ ahụ,
ọbara ndị e gburu egbu, na nke ndị a dọtara nʼagha,
na isi ndị ndu ndị iro.” 43Ṅụrịanụ ọṅụ mba niile, unu na ndị ya,
nʼihi na ọ ga-abọ ọbọ ọbara ndị ohu ya,
ọ ga-abọ ọbọ megide ndị iro ya,
kpuchiere ala ya na ndị ya mmehie ha. 44Mosis na Joshua* nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.