Native Bible

Deuteronomy 32:46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a.

Deuteronomy 32:46 in English

Deuteronomy 32:46 · Berean Standard Bible

he said to them, “Take to heart all these words I testify among you today, so that you may command your children to carefully follow all the words of this law.

Context

44Mosis na Joshua* nwa Nun soro bịa gụpụta mkpụrụ okwu abụ a na ntị ndị Izrel. 45Mgbe Mosis gụpụtachara abụ a nye ndị Izrel, 46ọ gwara ha okwu ndị a sị, “Na-atụgharịnụ uche nʼokwu niile m kwupụtara nye unu taa, ka unu si otu a nyefeekwa ya nʼaka ụmụ unu, ka ha onwe ha lezie anya debe okwu niile dị nʼiwu ndị a. 47Nʼihi na okwu ndị a abụghị okwu efu, ndụ unu dabeere na ha. Unu debe ha, unu ga-adị ndụ ogologo nʼime ala ahụ unu na-aga inweta nʼofe ọzọ nke osimiri Jọdan.” 48Nʼotu ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.