Native Bible

Deuteronomy 31:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,

Deuteronomy 31:25 in English

Deuteronomy 31:25 · Berean Standard Bible

he gave this command to the Levites who carried the ark of the covenant of the LORD:

Context

23Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.” 24Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ, 25o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha, 26“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu. 27Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ?

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.