Diuteronomi 31:26
Deuteronomy 31:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu.
Deuteronomy 31:26 in English
Deuteronomy 31:26 · Berean Standard Bible
“Take this Book of the Law and place it beside the ark of the covenant of the LORD your God, so that it may remain there as a witness against you.
Context
24Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ, 25o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha, 26“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu. 27Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ? 28Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.