Native Bible

Deuteronomy 31:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha.

Deuteronomy 31:28 in English

Deuteronomy 31:28 · Berean Standard Bible

Assemble before me all the elders of your tribes and all your officers so that I may speak these words in their hearing and call heaven and earth to witness against them.

Context

26“Werenụ Akwụkwọ Iwu a tinye ya nʼakụkụ igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị Chineke unu, ka ọ bụrụ ihe ịgba ama megide unu. 27Nʼihi na amaara m na unu bụ ndị nnupu isi, na ndị isiike. Lee, ọ bụladị taa m nọ ndụ nʼetiti unu, unu na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ, unu ga-esi aṅaa ghara inupu isi mgbe m nwụrụ? 28Kpọkọtaanụ ndị okenye unu niile, na ndị ọchịchị agbụrụ unu niile, ka m kwupụta okwu ndị a mgbe ha na-anụ ya. Ka m kpọkuokwa eluigwe na ụwa ka ha gbaa ama megide ha. 29Nʼihi na amaara m na mgbe m nwụrụ, unu ga-aghọ ndị rụrụ arụ nke ukwuu, unu ga-ewezuga onwe unu site nʼebe iwu ndị ahụ m nyere unu dị. Amakwaara m na nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, ihe ọjọọ ga-adakwasị unu, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere nʼihu Onyenwe anyị nke unu ji kpasuo ya iwe site nʼihe ndị ahụ unu ji aka unu kpụọ.” 30Ya mere, Mosis gụpụtara okwu niile dị nʼabụ a site na mbido ruo ọgwụgwụ na ntị nzukọ ndị Izrel niile. 31:12 Ọ bụ naanị na mmemme nke a, ka a na-akpọkọta ndị inyom na ụmụntakịrị, ka ha bịa nụrụ ihe a na-agụpụta site nʼakwụkwọ iwu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.