Native Bible

Deuteronomy 31:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.”

Deuteronomy 31:23 in English

Deuteronomy 31:23 · Berean Standard Bible

Then the LORD commissioned Joshua son of Nun and said, “Be strong and courageous, for you will bring the Israelites into the land that I swore to give them, and I will be with you.”

Context

21Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.” 22Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel. 23Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.” 24Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ, 25o nyere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị iwu sị ha,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.