Diuteronomi 31:22
Deuteronomy 31:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel.
Deuteronomy 31:22 in English
Deuteronomy 31:22 · Berean Standard Bible
So that very day Moses wrote down this song and taught it to the Israelites.
Context
20Mgbe m mere ka ha bata nʼala ahụ m kwere nna nna ha na nkwa, ala ahụ mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erugharị nʼime ya, mgbe ha rijukwara afọ, baakwa ụba, ha ga-ebido ife chi ọzọ ofufe, jụ m, ma mebikwaa ọgbụgba ndụ m. 21Ma mgbe ọtụtụ ihe ọdachi na ahụhụ ga-abịakwasị ha, abụ a ga-eme ka ha cheta ihe mere nsogbu ha niile ji bịakwasị ha, nʼihi na abụ a ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Amaara m nke ọma ugbu a, ọ bụladị tupu ha abanye nʼala ahụ m kwere nkwa inye ha site nʼịṅụ iyi, ụdị mmadụ ha bụ.” 22Ya mere, nʼụbọchị ahụ, Mosis dere abụ ahụ, kuziekwara ya ụmụ Izrel. 23Mgbe ahụ Onyenwe anyị nyere Joshua nwa Nun iwu sị ya, “Dị ike, nwee obi ike, ị ghaghị ịkpọbata ụmụ Izrel nʼala ahụ m sitere nʼịṅụ iyi kwee ha na nkwa. Mụ onwe m ga-anọnyere gị.” 24Mgbe Mosis dechara okwu niile nke iwu ndị a nʼakwụkwọ, site na mbido ruo nʼọgwụgwụ,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.