Diuteronomi 30:8
Deuteronomy 30:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa.
Deuteronomy 30:8 in English
Deuteronomy 30:8 · Berean Standard Bible
And you will again obey the voice of the LORD and follow all His commandments I am giving you today.
Context
6Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-ebi obi unu, na obi ụmụ unu, na nke ụmụ ụmụ unu ugwu, ka unu were obi unu niile na mmụọ unu niile, hụ ya nʼanya, ma dịkwa ndụ. 7Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka ọbụbụ ọnụ ndị a bịakwasị ndị iro unu, ndị kpọrọ unu asị na ndị na-akpagbu unu. 8Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. 10Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.