Diuteronomi 30:10
Deuteronomy 30:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
Deuteronomy 30:10 in English
Deuteronomy 30:10 · Berean Standard Bible
if you obey the LORD your God by keeping His commandments and statutes that are written in this Book of the Law, and if you turn to Him with all your heart and with all your soul.
Context
8Unu ga-emesịakwa rubere Onyenwe anyị isi, gbasookwa iwu ya niile nke m na-enye unu taa. 9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. 10Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu. 11Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. 12Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.