Native Bible

Deuteronomy 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime.

Deuteronomy 30:11 in English

Deuteronomy 30:11 · Berean Standard Bible

For this commandment I give you today is not too difficult for you or beyond your reach.

Context

9Mgbe ahụ, Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-eme ka unu babiga ụba oke nʼọrụ niile nke aka unu, nʼime mkpụrụ nke afọ, nʼime mkpụrụ nke anụ ụlọ gị, na mkpụrụ nke ala ubi gị. Obi ga-atọkwa Onyenwe anyị ụtọ ọzọ, ime gị ka ị baa ụba dịka ọ tọrọ ya nʼebe nna unu ha nọ. 10Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu. 11Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. 12Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.” 13Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.