Native Bible

Deuteronomy 30:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.”

Deuteronomy 30:12 in English

Deuteronomy 30:12 · Berean Standard Bible

It is not in heaven, that you should need to ask, ‘Who will ascend into heaven * to get it for us and proclaim it, that we may obey it?’

Context

10Ma ọ bụrụ na unu erubere Onyenwe anyị bụ Chineke unu isi, debekwa iwu ya na ụkpụrụ ya niile nke e dere nʼAkwụkwọ iwu a, jirikwa obi unu niile na mmụọ unu niile bịaghachikwute Onyenwe anyị bụ Chineke unu. 11Idebe iwu ndị a m na-enye unu taa abụghị ọrụ sịrị ike, ọ bụkwaghị ihe karịrị unu ike ime. 12Nʼihi na iwu ndị a adịghị nʼeluigwe nke ị ga-eji sị, “Onye ga-arịgo nʼeluigwe wedatara m ya ka m nụ ihe ọ na-ekwu, ma debekwa ya.” 13Iwu a adịghịkwa nʼofe ọzọ nke oke osimiri, nke ị ga-eji sị, “Onye ga-agafe ga weta ya, kpọsaa ya nye anyị ka anyị nụ, ma debekwa ihe ọ na-ekwu?” 14Mba, okwu ahụ dị gị nso, ọ dị gị nʼọnụ, dịrịkwa nʼobi gị, ka i nwee ike idebe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.