Native Bible

Deuteronomy 3:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume,* nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.”

Deuteronomy 3:28 in English

Deuteronomy 3:28 · Berean Standard Bible

But commission Joshua, encourage him, and strengthen him, for he will cross over ahead of the people and enable them to inherit the land that you will see.”

Context

26Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a. 27Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 28Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume,* nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.” 29Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa. 3:28 Ọnụ 27:18,23; Dit 31:3,7-8,23

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.