Diuteronomi 3:27
Deuteronomy 3:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan.
Deuteronomy 3:27 in English
Deuteronomy 3:27 · Berean Standard Bible
Go to the top of Pisgah and look to the west and north and south and east. See the land with your own eyes, for you will not cross this Jordan.
Context
25Kwere ka m gafee hụ ala ọma ahụ dị nʼofe ọzọ nke Jọdan, ala ugwu ugwu ahụ mara mma, na Lebanọn.” 26Ma nʼihi unu, Onyenwe anyị wesoro m iwe jụ ige m ntị! Onyenwe anyị gwara m okwu sị m, “O zuola! Agwakwala m ihe ọbụla banyere okwu a. 27Gaa, rigoruo nʼelu ugwu Pisga, site nʼebe ahụ lepụ anya nʼakụkụ ugwu na ndịda ma nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ. Ọ bụ anya gị ka ị ga-eji hụ ala ahụ, nʼihi na ị gaghị agafe osimiri Jọdan. 28Nye Joshua ike ka ọ nọchie ọnọdụ gị. Gbaakwa ya ume,* nʼihi na ọ bụ ya ga-edu ndị a gafee Jọdan iketa ala ahụ niile ị ga-ahụ.” 29Ya mere, anyị nọdụrụ na ndagwurugwu ahụ dị nso na Bet-Peoa.
3:28 Ọnụ 27:18,23; Dit 31:3,7-8,23
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.