Diuteronomi 28:17
Deuteronomy 28:17 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ.
Deuteronomy 28:17 in English
Deuteronomy 28:17 · Berean Standard Bible
Your basket and kneading bowl will be cursed.
Context
15Ma otu ọ dị, ọ bụrụ na ị jụ irubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, jụkwa ilezi anya, gbasoo iwu ya na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa, ọbụbụ ọnụ ndị a ga-adakwasị gị. 16Ị ga-abụ onye a bụrụ ọnụ nʼobodo, bụrụ onye a bụrụ ọnụ nʼala ubi, 17Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ. 18Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ. 19Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.