Native Bible

Deuteronomy 28:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ.

Deuteronomy 28:19 in English

Deuteronomy 28:19 · Berean Standard Bible

You will be cursed when you come in and cursed when you go out.

Context

17Abọ gị na ihe ịgwọ achịcha gị ga-abụ ihe a bụrụ ọnụ. 18Ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke afọ gị ga-abụ, ihe a bụrụ ọnụ ka mkpụrụ nke ala gị ga-abụ, ya na ụmụ nke igwe anụ ụlọ gị, na ụmụ ehi gị na nke igwe ewu na atụrụ gị mụrụ. 19Onye a bụrụ ọnụ ka ị ga-abụ mgbe ị na-abata abata na mgbe ị na-apụ apụ. 20Onyenwe anyị ga-ezidata nʼisi gị ọbụbụ ọnụ, na ọgbaaghara, tinyere nkọcha nʼihe niile nke i tinyere aka gị, tutu ruo mgbe ị ghọrọ onye e bibiri ebibi bụrụ onye lara nʼiyi na mberede, nʼihi ihe ọjọọ niile i mere site nʼịhapụ m. 21Onyenwe anyị ga-ezite ajọ ọrịa nʼetiti gị tutu ruo mgbe a ga-ekpochapụ gị site nʼala ahụ ị gaje ịba nʼime ya inweta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.