Diuteronomi 27:16
Deuteronomy 27:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.” Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Deuteronomy 27:16 in English
Deuteronomy 27:16 · Berean Standard Bible
‘Cursed is he who dishonors his father or mother.’ And let all the people say, ‘Amen!’
Context
14Ndị Livayị ga-eji olu dị elu gụpụta ya nye ụmụ Izrel niile, 15“Onye a bụrụ ọnụ ka mmadụ ahụ bụ nke na-apị arụsị maọbụ oyiyi ọbụla, akaọrụ onye ǹka, nke bụ ihe arụ nʼanya Onyenwe anyị, ma na-eguzobe ya na nzuzo.”
Ndị mmadụ niile ga-aza sị, “Amen.” 16“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ, nke na-elelị nna ya na nne ya.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 17“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-ehigharị oke ala onye agbataobi ya.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.” 18“Onye a bụrụ ọnụ ka onye ahụ bụ nke na-eduhie onye ìsì ụzọ.”
Ụmụ Izrel niile ga-aza, “Amen.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.