Native Bible

Deuteronomy 17:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,

Deuteronomy 17:8 in English

Deuteronomy 17:8 · Berean Standard Bible

If a case is too difficult for you to judge, whether the controversy within your gates is regarding bloodshed, lawsuits, or assaults, you must go up to the place the LORD your God will choose.

Context

6Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara. 7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị. 8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara, 9nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ. 10Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.