Native Bible

Deuteronomy 17:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka.

Deuteronomy 17:10 in English

Deuteronomy 17:10 · Berean Standard Bible

You must abide by the verdict they give you at the place the LORD will choose. Be careful to do everything they instruct you,

Context

8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara, 9nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ. 10Ị ga-emekwa dịka mkpebi ha nyere gị nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. Lezie anya hụ na i mezuru ihe niile dịka ha si tụziere gị aka. 11Mee dịka iwu ha ziri gị si dị, na dịka mkpebi ha nyere gị si dị. Ewezugala onwe gị site nʼokwu ha nyere gị nʼụzọ ọbụla 12Ma onye ahụ ledara onye nchụaja na onye ikpe ahụ a họpụtara ije ozi nye Onyenwe anyị Chineke gị ga-anwụ. Unu ga-esi nʼala Izrel wezuga ihe ọjọọ dị otu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.