Diuteronomi 17:7
Deuteronomy 17:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị.
Deuteronomy 17:7 in English
Deuteronomy 17:7 · Berean Standard Bible
The hands of the witnesses shall be the first in putting him to death, and after that, the hands of all the people. So you must purge the evil from among you.*
Context
5kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya. 6Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara. 7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị. 8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara, 9nʼihu ndị nchụaja, bụ ndị Livayị na onye nọ nʼoche ikpe nʼoge ahụ ka ha gbubie ikpe ahụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.