Native Bible

Deuteronomy 17:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara.

Deuteronomy 17:6 in English

Deuteronomy 17:6 · Berean Standard Bible

On the testimony of two or three witnesses a man shall be put to death, but he shall not be executed on the testimony of a lone witness.

Context

4ọ bụrụ na e mere ka ị maara nʼihe dị otu a dị maọbụ ị nụ ya, ị ghaghị ịjụ ase, nyochaa ya nke ọma. Ọ bụrụ na ihe ị nụrụ bụ eziokwu, ọ bụrụ nʼezie na e mere ihe arụ dị otu a nʼala Izrel, 5kpọrọ nwoke maọbụ nwanyị ahụ mere ihe ọjọọ dị otu a, kpọpụta ya nʼọnụ ụzọ ama obodo, tụọ ya nkume, tugbuo ya. 6Ma otu o si dị, a gaghị eme ka onye ahụ nwụọ site naanị nʼama otu mmadụ, kama ọ ga-anwụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara. 7Ndị ahụ gbara akaebe nʼisi ya ga-eburu ụzọ tụọ ya nkume, tupu mmadụ niile esoro tugbuo ya. Site nʼụzọ dị otu a, unu ga-ekpochapụ ihe ọjọọ site nʼetiti gị. 8Ọ bụrụ na unu enwee okwu siri ike na mkpebi, dịka igbu ọchụ, maọbụ okwu na ụka metụtara mmadụ, maọbụ ịlụ ọgụ nke mmerụ ahụ dapụtara nʼime ya, ihe unu ga-eme bụ iweta ikpe ahụ nʼebe obibi Onyenwe anyị Chineke gị họpụtara,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.