Diuteronomi 14:5
Deuteronomy 14:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.
Deuteronomy 14:5 in English
Deuteronomy 14:5 · Berean Standard Bible
the deer, the gazelle, the roe deer, the wild goat, the ibex, the antelope, and the mountain sheep.
Context
3Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ. 4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu, 5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu. 6Anụmanụ ọbụla ụkwụ ya wara njakpa, nke na-atagharị ọnụ ka unu ga-eri. 7Ma otu ọ dị, nʼetiti anụ ndị ahụ na-atagharị nri maọbụ ndị ụkwụ ha wara njakpa, ndị a ka unu na-agaghị eri, ịnyịnya kamel, na ewi maọbụ ewi nkume, na anụ ndị ọzọ yiri ha, ọ bụ ezie na ha na-atagharị ọnụ, ma ha enweghị ụkwụ wara njakpa. Ha bụ ihe na-adịghị ọcha nye unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.