Native Bible

Deuteronomy 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ.

Deuteronomy 14:3 in English

Deuteronomy 14:3 · Berean Standard Bible

You must not eat any detestable thing.

Context

1Unu onwe unu bụ ụmụ Onyenwe anyị Chineke unu, ya mere unu egbula onwe unu mma, maọbụ kpụchapụ agịrị isi dị nso nso egedege ihu unu nʼihi onye nwụrụ anwụ.* 2Nʼihi na onye dị nsọ ka ị bụ nye Onyenwe anyị Chineke gị. Ọ bụkwa gị ka Onyenwe anyị họọrọ site na ndị niile nọ nʼelu ụwa, ị bụ ihe oke ọnụahịa nye ya. 3Erila ihe ọbụla m kwuru na ọ bụ ihe rụrụ arụ. 4Ndị a bụ anụmanụ unu ga-eri: ehi, atụrụ, na ewu, 5na ele nta, na mgbada, na atụrụ ọhịa, na ewu ọhịa, ele ukwu, na anịgọ bi nʼelu ugwu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.