Native Bible

Deuteronomy 12:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja.

Deuteronomy 12:27 in English

Deuteronomy 12:27 · Berean Standard Bible

Present the meat and blood of your burnt offerings on the altar of the LORD your God. The blood of your other sacrifices must be poured out beside the altar of the LORD your God, but you may eat the meat.

Context

25Erila ya, ka ihe si otu a gaara gị na ụmụ ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ị na-eme ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị. 26Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. 27Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja. 28Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme. 29Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.