Diuteronomi 12:29
Deuteronomy 12:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha.
Deuteronomy 12:29 in English
Deuteronomy 12:29 · Berean Standard Bible
When the LORD your God cuts off before you the nations you are entering to dispossess, and you drive them out and live in their land,
Context
27Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja. 28Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme. 29Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha. 30Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.” 31Efekwala Onyenwe anyị bụ Chineke gị dịka ha si efe chi ha, nʼihi na mgbe ha na-efe chi ha ofufe, ha na-eme ihe arụ dị iche iche nke Onyenwe anyị kpọrọ asị. Ọ bụladị ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom ka ha na-esure nʼọkụ nye chi ha dị iche iche dịka aja.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.