Diuteronomi 12:28
Deuteronomy 12:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme.
Deuteronomy 12:28 in English
Deuteronomy 12:28 · Berean Standard Bible
Be careful to obey all these things I command you, so that it may always go well with you and your children after you, because you will be doing what is good and right in the eyes of the LORD your God.
Context
26Ma were ihe ndị ahụ niile i doro nsọ, ya na ihe ọbụla i kwere Onyenwe anyị na nkwa gaa nʼebe ahụ Onyenwe anyị ga-ahọpụta. 27Chụọ aja nsure ọkụ nʼelu ebe ịchụ aja Onyenwe anyị Chineke gị, ma anụ na ọbara. A ghaghị ịwụsa ọbara anụ ahụ e ji chụọ aja nʼakụkụ ebe nchụaja nke Onyenwe anyị Chineke gị. Ma i nwere ike rie anụ ahụ e ji chụọ aja. 28Lezie anya, debe iwu ndị a niile m na-enye gị. Ọ bụrụ na i mee ya, ihe ga-agara gị na ụmụ gị nke ọma, nʼihi na ọ bụ ihe dị mma nʼanya Onyenwe anyị Chineke gị, na ihe ziri ezi ka ị ga na-eme. 29Onyenwe anyị Chineke gị ga-ala mba niile bi nʼala ahụ ị na-aga ibuso agha nʼiyi. Ma mgbe i si nʼala ahụ chụpụ ha, ị ga-ebichi nʼala ha. 30Mgbe ị lachara ha nʼiyi, lezie anya ka ị ghara ịma nʼọnya, site nʼịjụ ajụjụ ka ịjụpụta otu ha si efe chi ha, na-asị, “Mba ndị a o si aṅaa na-efe chi ha ofufe? Anyị ga-emekwa otu a.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.