Diuteronomi 11:20
Deuteronomy 11:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị.
Deuteronomy 11:20 in English
Deuteronomy 11:20 · Berean Standard Bible
Write them on the doorposts of your houses and on your gates,
Context
18Meenụ ka okwu m ndị a dịgide nʼobi unu na nʼime mmụọ unu. Keenụ ha dịka ihe ịrịbama nʼelu aka unu, kekwasịkwa ha dịka ihe ncheta nʼegedege ihu unu. 19Kuzierenụ ha ụmụ unu, na-ekwu ihe banyere ha mgbe ị na-anọdụ nʼụlọ gị, na mgbe ị na-aga nʼokporoụzọ, mgbe ị na-edina ala na mgbe i si nʼihe ndina bilie. 20Dee ha nʼelu ibo ọnụ ụlọ gị na nke ọnụ ụzọ ama gị. 21Ka ụbọchị ndụ unu na nke ụmụ unu dị ogologo nʼala ahụ unu na-aga ibi nʼime ya, nke Onyenwe anyị kwere nna unu na nkwa. Dịka ogologo ụbọchị niile ha nke eluigwe dị nʼelu, ụwa dịkwa nʼokpuru ya. 22Ọ bụrụ na unu elezie anya debe iwu niile m na-enye unu taa, na-ahụkwa Onyenwe anyị Chineke unu nʼanya, na-eso ụzọ ya, na-adaberekwa na ya,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.